Zefanaia 1 IGBOB

1 Okwu Jehova nke ruru Zefanaia nwa Kushi, nwa Gedalaia, nwa Amaraia, nwa Hezekaia, nti, n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda.

2 M'gēkpochapusi ihe nile n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

3 M'gēkpochapu madu na anumanu; M'gēkpochapu anu-ufe nke elu-igwe, na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ nile, ha na ndi nēmebi iwu; M'gēbipu kwa madu n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

4 M'gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M'gēbipu kwa ndi Beal fọduru n'ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile;

5 na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi;

6 na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.

7 Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ.

8 Ọ gēru kwa, n'ubọchi àjà Jehova, na M'gēji nmehie ndi-isi, ji kwa nmehie umu eze, ji kwa nmehie ndi nile nēyi uwe ala ọzọ, leta ha.

9 M'gēji kwa nmehie onye ọ bula nke nāmabiga nbata-uzọ leta ya n'ubọchi ahu, bú ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n'ihe-ike na aghughọ.

10 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n'ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n'obodo nke-abua, na oké ntiwa site n'ugwu ntà nile.

11 Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n'ihi na ndi Kenean nile alawo n'iyì: ebipuwo ndi nile eboro ọla-ọcha.

12 Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M'gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n'idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ.

13 Àkù-ha gāghọ kwa ihe apunaraworo ha, ulo nile ha gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: e, ha gēwu ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ma ha agaghi-aṅu manya-vine-ha.

14 Oké ubọchi Jehova di nso, ọ di nso, ọ nēme kwa ngwa nke-uku: ge nti olu ubọchi Jehova; dike nēti nkpu di ilu n'ebe ahu.

15 Ubọchi nrubiga-ókè nke iwe ka ubọchi ahu bu, ubọchi ahuhu na nkpab͕u, ubọchi nke ime nkpọnkpọ-ebe na itọb͕ọrọ n'efu, ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri,

16 ubọchi opì-ike na iti-nkpu agha, imegide obodo nile ewusiri ike, na imegide ulo-nkuku nile di elu.

17 M'gēme kwa ka nkpà kpa madu, ha ewe jegharia dika ndi-ìsì, n'ihi na ọ bu Jehova ka ha mehieworo megide: agāwusi kwa ọbara-ha dika ájá, wusi kwa anu-aru-ha dika ǹsí.

18 Ọla-ọcha-ha ma-ọbu ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha anaputa n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ma agēji ọku nke ekworo-Ya ripia ala-ha nile: n'ihi na ngwusi, nke bu nání obi-ọlulọ-miri, ka Ọ gēme ka ndi nile bi n'ala nka gwusia.

isiakwụkwọ

1 2 3