10 Tie nkpu ọṅù, ṅuria, gi ada Zaion: n'ihi na, le, Mu nābia, M'gēbi kwa n'etiti gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
11 Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n'ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M'gēbi kwa n'etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi.
12 Jehova gēketa kwa Juda n'òkè-Ya n'elu ala nsọ a, rọputa kwa Jerusalem ọzọ.
13 Dere du, unu anu-aru nile, n'iru Jehova: n'ihi na O siwo n'ebe-obibi-Ya di nsọ teta.