3 Ma, le, mọ-ozi nke nagwām okwu nāpu, mọ-ozi ozọ nāpu kwa izute ya,
4 si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya.
5 N'ihi na Mu onwem gāburu ya mb͕idi ọku buruburu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa ebube ka M'gāghọ n'etiti ya.
6 Éwù, éwù, sinu n'ala Ugwu b͕alaga, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na dika ifufe anọ nke elu-igwe ka M'chusaworo unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
7 Éwù, gi Zaion, wepuga onwe-gi, gi nwanyi nke gi na ada Babilon nēbi.
8 N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.
9 N'ihi na, le, M'gaje ifeghari akam n'aru ha, ha gābu-kwa-ra ndi nēfè ha ihe-nkwata: unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezitewom.