10 N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile.
11 M'we za, si ya, Gini bu osisi olive abua ndia nke di n'aka-nri ebe-idọba-oriọna nka na n'aka-ekpe-ya?
12 M'we za nke ub͕ò abua, si ya, Gini bu ngalaba abua nke osisi olive ndia nke nēsi n'ihe ọla-edo abua eji ab͕apu manu b͕apu manu ọla-edo n'onwe-ha?
13 O we gwam okwu, si, I maghi ihe ndia bu? M'we si, É-è, onye-nwem.
14 Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n'akuku Onye-nwe uwa nka nile.