3 O we sim, Nka bu ọb͕ub͕a-iyi nke nāpùru iru ala nka nile: n'ihi na onye ọ bula nke nēzu ori ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di; ọ bu kwa onye ọ bula nke nāṅu iyi ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di.
4 Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.
5 Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we puta, sim, Biko, welie anya-gi abua, hu ihe ọ bu, bú ihe a nke nāpu apu.
6 M'we si, Gini ka ọ bu? Ọ si, Nka bu ihe-ọtùtù ephah nke nāpu apu. O we si, Nka bu oyiyi-ha n'ala nka nile:
7 (ma le, otù buruburu opù anēbuli ebuli:) nka bu kwa otù nwanyi nke nānọdu n'etiti ephah ahu.
8 O we si, Nka bu Nmebi-iwu; o we tubà ya n'etiti ephah ahu: o we tukwasi nkume opù ahu n'ọnu-ya.
9 M'we welie anyam abua, hu, ma le, ndinyom abua nāputa, ifufe di kwa na nkù-ha, n'ihi na ha nwere nkù abua dika nkù ub͕ala: ha we bulie ephah ahu n'etiti ala na elu-igwe.