7 Inyinya nwere ume pu-kwa-ra, chọ ije ka ha we jegharia n'uwa: o we si, J nu, jegharia n'uwa. Ha we jegharia n'uwa.
8 O we kpọsiem òkù ike gwam okwu, si, Le, Ndi ahu nke nāpu rue ala Ugwu emewo ka Mọm zue ike n'ala Ugwu.
9 Okwu Jehova we ruem nti, si,
10 Nara ihe n'aka ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú n'aka Heldai, na n'aka Tobaija, na n'aka Jedaia; gi onwe-gi bia kwa n'ubọchi ahu, bata n'ulo Josaia nwa Zefanaia, bú nke ha biaruworo site na Babilon;
11 e, nara ọla-ọcha na ọla-edo, kpua okpu-eze, kpube n'isi Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà;
12 gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Le, otù onye nke Ihe-opupú bu aha-ya; ọ bu kwa n'ọnọdu-ya ka ọ gēsi pú, ọ gēwu kwa ulo uku Jehova:
13 ọbuná ya onwe-ya gēwu ulo uku Jehova; ọ bu kwa ya onwe-ya gēburu ebube nile, nọdu nāchi n'oche-eze-ya; otù onye-nchu-àjà gādi kwa n'oche-eze-ya: ndum-ọdu udo gādi kwa n'etiti ha abua.