12 Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist.
13 Èkèwo Kraist èkè? ọ̀ gābu na akpọgidere Pọl n'obe n'ihi unu? mà-ọbu na emere unu baptism ibà n'aha Pọl?
14 Anamekele Chineke na ọ dighi onye ọ bula n'etiti unu m'mere baptism, ma-ọbughi Krispọs na Gaiọs;
15 ka onye ọ bula ghara isi na emere unu baptism ibà n'aha nkem.
16 Ma eme-kwa-ram èzí-na-ulo Stefanas baptism: ma ewepu ndia, amataghm ma emerem onye ọ bula ọzọ baptism.
17 N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu.
18 N'ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n'iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke.