1. Ndi Kọrint 2 IGBOB

1 Mu onwem kwa, umu-nnam, mb͕e m'biakutere unu, abiaghm n'ọ̀kà okwu ma-ọbu n'ọ̀kà amam-ihe, nēkwusara unu àmà nke Chineke.

2 N'ihi na ezuberem ka m'ghara imata ihe ọ bula n'etiti unu, ma-ọbughi Jisus Kraist, ka m'mata kwa Onye ahu ka onye akpọgideworo n'obe.

3 Mu onwem nọ kwa n'etiti unu n'adighi-ike, na n'egwu, na n'oké ima-jijiji.

4 Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:

5 ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke.

6 Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n'etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè:

7 kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:

8 nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:

9 kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa,Nke nābàghi kwa n'obi madu,Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya.

10 Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.

11 N'ihi na ònye n'etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke.

12 Ma ayi onwe-ayi anataghi mọ nke uwa, kama ọ bu Mọ Nke sitere na Chineke; ka ayi we mata ihe nile Chineke were amara nye ayi.

13 Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ.

14 Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha.

15 Ma onye Mọ Nsọ nāchi nēsikwuputa ihe nile, ma ọ dighi onye ọ bula nēsikwuputa ya onwe-ya.

16 N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi, ka o zí Ya ihe? Ma ayi onwe-ayi nwere uche nke Kraist.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16