1. Ndi Kọrint 15 IGBOB

1 Ma emem ka unu mara, umu-nnam, ozi ọma ahu nke m'zìri unu, nke unu nata-kwa-ra, nke unu nēguzo kwa nime ya,

2 nke esite-kwa-ra zọputa unu, ma ọ buru na unu jidesie ya ike, bú aha okwu m'ji zì unu ozi ọma ahu, ma asi na ọ bughi na unu kwere n'efu.

3 N'ihi na enyerem n'aka-unu na mbu ihe m'nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n'ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di;

4 na elì-kwa-ra Ya; na emewo-kwa-ra ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di;

5 na O me-kwa-ra ka Kifas hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi iri na abua ahu hu Ya anya;

6 emesia O mere ka ndi kari nnù madu na ọgu ise n'etiti umu-nna-ayi hu Ya anya n'otù mb͕e, ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti ndi ahu nānọgide rue ub͕u a, ma ufọdu adawo n'ura ọnwu;

7 emesia O mere ka Jemes hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi nile hu Ya anya;

8 ma n'ikpe-azu ha nile, dika nwa amukworo amukwo, O mere ka mu onwem hu kwa Ya anya.

9 N'ihi na mu onwem dikarisiri ntà n'etiti ndi-ozi, ebe m'nērughi ka akpọm onye-ozi, n'ihi na esob͕urum nzukọ Chineke.

10 Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.

11 Ya mere ma ọ buru mu onwem, ma-ọbu ndi ahu, otú a ka ayi nēkwusa, otú a ka unu kwe-kwa-ra.

12 Ma ọ buru na anēkwusa na emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ùfọdu n'etiti unu si aṅa nēkwu na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi?

13 Ma ọ buru na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu adighi, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie:

14 ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, ya mere ihe ayi nēkwusa bu ihe-efu, okwukwe-unu bu kwa ihe-efu.

15 Ọzọ kwa, anāhu na ayi bu ndi-àmà ugha nke Chineke; n'ihi na ayi b͕ara àmà megide Chineke na O mere ka Kraist ahu si n'ọnwu bilie; bú Onye Ọ nēmeghi ka O si n'ọnwu bilie, ma ọ buru na ọ bu ezie na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie.

16 N'ihi na asi na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, emeghi kwa ka Kraist si n'ọnwu bilie:

17 ma ọ buru na emeghi ka Kraist si n'ọnwu bilie, okwukwe-unu bu ihe-efu; unu nānọ na nmehie nile unu ub͕u a.

18 Ya mere ndi da-kwa-ra n'ura ọnwu nime Kraist lara n'iyì.

19 Asi na ọ bu nání na ndu a ka ayi nweworo olile-anya-ayi nime Kraist, ayi bu ndi kwesiri ebere kari madu nile.

20 Ma otú ọ di, emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n'ura ọnwu.

21 N'ihi na ebe ọnwu sitere n'aka madu, nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu site-kwa-ra n'aka madu.

22 N'ihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam, ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu.

23 Ma madu nile n'otù n'otù n'usoro nke aka ha: Kraist, dika nkpuru mbu; emesia ndi nke Kraist, n'ọbibia-Ya.

24 Emesia ọgwugwu ihe nile gābia, mb͕e ọ bula Ọ gārara ala-eze-Ya nye n'aka Chineke, Onye bu kwa Nna; mb͕e ọ bula Ọ gēmewori ka ọbubu-isi nile na ichi-isi nile na ike nile ghara idi irè.

25 N'ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n'okpuru ukwu-Ya.

26 Dika onye-iro ikpe-azu, agaje ime ka ọnwu ghara idi irè.

27 N'ihi na, Ihe nile ka O doro n'okpuru ukwu-Ya abua. Ma mb͕e ọ bula O gēkwuwori, si, Edowo ihe nile n'okpuru Ya, ọ putara ìhè na Ọ nọghi ya, bú Onye doro ihe nile n'okpuru Ya.

28 Ma mb͕e ọ bula agēdowori ihe nile n'okpuru Ya, mb͕e ahu ka agēdo Ọkpara ahu Onwe-ya n'okpuru Onye ahu Nke doro ihe nile n'okpuru Ya, ka Chineke we buru ihe nile nime ihe nile.

29 N'ihi na asi na ọ dighi otú a, gini ka ha gēme, bú ndi anēme baptism n'ọnọdu ndi nwuru anwu? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie ma-ọli, ọ̀ bu kwa gini mere anēme ha baptism n'ọnọdu ha?

30 Gini me-kwa-ra ayi onwe-ayi nānọ n'ize-ndu oge hour nile ọ bula?

31 Ejim inya-isi ahu n'aru-unu, umu-nnam, nke m'nānya nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, we kwusie ike na anamanwu kwa-ubọchi.

32 Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n'Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.

33 Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.

34 Sinu n'ura manya teta n'uzọ ezi omume, unu emehie-kwa-la; n'ihi na ufọdu nēnwe amaghi-ihe bayere Chineke: anamekwu nka ka m'me unu ihere n'iru.

35 Ma otù onye gāsi, Èsi aṅa eme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie? ọ̀ bu kwa ahà aru gini ka ha ji bia?

36 Onye nēnweghi uche, adighi-eme ka nkpuru gi onwe-gi nāgha di ndu, ma ọ buru na ọ nwughi anwu:

37 ihe i nāgha kwa, ọ bughi aru gāputa ka i nāgha, kama ọ bu nkpuru efu, ma eleghi anya ọ gābu ọka, ma-ọbu nkpuru ọ bula nime nkpuru fọduru;

38 ma Chineke nēnye ya aru dika Ọ chọrọ, nēnye kwa nkpuru ọ bula nime nkpuru nile aru nke aka ya.

39 Anu-aru nile abughi otù anu-aru: kama otù anu-aru nke madu di, anu-aru ọzọ nke anumanu di kwa, anu-aru ọzọ nke nnunu di kwa, anu-aru ọzọ nke azù di kwa.

40 Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa: ma ebube nke aru nke elu-igwe bu otù, ebube nke aru nke uwa di kwa iche.

41 Otù ebube nke anyanwu di, ebube ọzọ nke ọnwa di kwa, ebube ọzọ nke kpakpando di kwa; n'ihi na otù kpakpando di iche n'aru kpakpando ọzọ n'ebube.

42 Otú a ka nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu di kwa. Anāgha ya n'ire-uré; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ereghi-uré:

43 anāgha ya n'ihe-ihere; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ebube: anāgha ya n'adighi-ike; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ike:

44 anāgha ya aru nke nkpuru-obi nāchi; anēme ka o si n'ọnwu bilie aru nke Mọ di nime ya nāchi. Ọ buru na aru nke nkpuru-obi nāchi di, aru nke Mọ nāchi di kwa.

45 Otú a ka edewo-kwa-ra ya n'akwukwọ, si, Madu mbu, bú Adam, ghọrọ nkpuru-obi di ndu. Adam ikpe-azu ghọrọ mọ nke nēnye ndu.

46 Otú ọ di, nke Mọ nāchi ebughi uzọ, kama ọ bu nke nkpuru-obi nāchi; emesia nke Mọ nāchi soro.

47 Madu mbu sitere n'ala, eji-kwa-ra ájá kpu ya: Madu nke-abua sitere n'elu-igwe.

48 Aha madu onye ahu ejiri ájá kpu di, madu di otú a ka ndi eji ájá kpu di kwa: ọzọ, aha madu Onye elu-igwe ahu di, madu di otú a ka ndi elu-igwe di kwa.

49 Dika ayi yiri kwa onyinyo nke onye ahu eji ájá kpu, ayi gēyiri kwa onyinyo nke Onye elu-igwe ahu.

50 Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, na anu-aru na ọbara apughi iketa ala-eze Chineke; ihe nēre uré eketaghi kwa ereghi-uré.

51 Le, agwam unu ihe-omimi: Ọ bughi ayi nile gāda n'ura ọnwu, ma agēnwo ayi nile,

52 n'oge dikarisiri ntà, n'otù ntabi-anya, mb͕e agāfù opì ikpe-azu: n'ihi na agāfù opì, agēme kwa ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie nāpughi ire uré, agēnwo kwa ayi onwe-ayi.

53 N'ihi na aru a nke puru ire uré aghaghi iyikwasi ereghi-uré, aru a nke puru inwu anwu aghaghi iyikwasi anwughi-anwu.

54 Ma mb͕e ọ bula aru a nke puru ire uré gēyikwasiwori ereghi-uré, mb͕e aru a nke puru inwu anwu gēyikwasiwori anwughi-anwu kwa, mb͕e ahu okwu ahu edeworo n'akwukwọ nsọ gēme, bú, Eloro ọnwu rue nmeri.

55 Ọnwu, òle ebe nmeri-gi di? Ọnwu, òle ebe ihe-ọb͕ub͕a-gi di?

56 Ihe-ọb͕ub͕a nke ọnwu bu nmehie; ike nke nmehie bu kwa iwu:

57 ma ekele diri Chineke, Onye nēnye ayi nmeri site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.

58 Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16