22 Ma-ọbu àyi nākpasu Onye-nwe-ayi ekworo? àyi ka Ya ike?
23 Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile bara urù. Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nēwuli madu elu dika ulo.
24 Ka onye ọ bula ghara ichọ ọdi-nma nke aka ya, kama ọdi-nma nke madu-ibe-ya.
25 Ihe nile ọ bula anēre n'ahia anu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche;
26 n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.
27 Ọ buru na onye ọ bula n'etiti ndi nēkweghi akpọ unu n'oriri, ọ buru kwa na unu achọ ije; ihe ọ bula anēdebe n'iru unu, rienu ya, ghara iju ajuju n'ihi akọ-na-uche.
28 Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n'àjà, unu erila, n'ihi onye ahu nke gosiri ya, na n'ihi akọ-na-uche: