9 Otú a unu onwe-unu kwa, ma ọ buru na unu ejighi ire kwu okwu di nfe ighota, àgēsi aṅa mara ihe anēkwu? n'ihi na unu ganēkwu okwu nye ifufe.
10 Agāsi na ọtutu aha olu di iche iche di n'uwa, ọ dighi kwa ihe ọ bula nke nēnweghi olu.
11 Ya mere asi na amataghm isi olu ahu, m'gābu onye nāsu asusu ọzọ n'anya onye ahu nēkwu okwu, onye ahu nēkwu okwu gābu kwa onye nāsu asusu ọzọ n'anyam.
12 Otú a unu onwe-unu kwa, ebe unu bu ndi nēwere obi nānu ọku chọ onyinye nile nke Mọ Nsọ, nāchọnu ka unu we babiga ókè nime ha, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.
13 N'ihi nka onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ya kpere Chineke ka o we sugharia.
14 N'ihi na asi na ejim asusu di iche nēkpe ekpere, mọm nēkpe ekpere, ma uchem amighi nkpuru.
15 Ọ̀ bu gini kwa? m'gēji mọm kpe ekpere, ma m'gēji kwa uchem kpe ekpere: m'gēji mọm bù abù ọma, ma m'gēji kwa uchem bù abù ọma.