1 Ma okwu bayere ùtú anāturu ndi nsọ, dika m'nyere nzukọ Kraist di na Galetia iwu, unu onwe-unu me kwa otú a.
2 Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia.
3 Ma mb͕e ọ bula m'biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m'gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem:
4 ma asi na ọ kwesiri ka mu onwem je kwa, ha gēsom je.