17 Anamaṅuri kwa ọṅu n'ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n'ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem.
18 N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.
19 Nzukọ Kraist nile nke di n'Esia nēkele unu. Akwila na Priska nēkele unu ọtutu ekele nime Onye-nwe-ayi, ha na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.
20 Umu-nna-ayi nile nēkele unu. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.
21 Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de.
22 Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n'anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.
23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.