15 N'ihi na asi na unu nwere orú nnù ndi-ozizí na nnù ndi-ozizí ise nime Kraist, ma unu enweghi ọtutu nna: n'ihi na mu onwem nime Kraist Jisus were ozi ọma mu unu.
16 Ya mere ariọm unu, burunu ndi nēṅomim.
17 N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.
18 Ma ufọdu fuliri onwe-ha elu, dika agāsi na m'gaghi-abiakute unu.
19 Ma m'gābiakute unu ọsọsọ, ma ọ buru na Onye-nwe-ayi chọrọ; m'gāmara kwa, ọ bughi okwu nke ndi fuliworo onwe-ha, kama ike-ha.
20 N'ihi na ala-eze Chineke adighi n'okwu-ọnu, kama n'ike.
21 Gini ka unu nāchọ? ọ̀ bu utari ka m'gēwere biakute unu, ma-ọbu ihu-n'anya na mọ nke idi-nwayọ?