11 Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.
12 Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nābaram urù. Ihe nile zirim ezi n'iwu; ma ọ dighi ihe ọ bula gāchi mu onwem.
13 Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi:
14 ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie.
15 Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela.
16 Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.
17 Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.