13 Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi:
14 ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie.
15 Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela.
16 Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru.
17 Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.
18 B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.
19 Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;