17 Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.
18 B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.
19 Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;
20 n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu.