1 Ma okwu bayere ihe unu dere akwukwọ bayere ha: Ọ di nma ka nwoke ghara imetu nwanyi aka.
2 Ma, n'ihi ikwa-iko nile, ka nwoke ọ bula nwe nwunye nke aka ya, ka nwanyi ọ bula nwe kwa di nke aka ya.
3 Ka di kwughachi nwunye-ya ugwọ o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwughachi kwa di-ya ugwọ o ji ya.
4 Ọ bughi nwunye nāchi aru nke onwe-ya, kama ọ bu di-ya: otú a kwa ọ bughi di nāchi kwa aru nke onwe-ya, kama ọ bu nwunye-ya.