21 Àkpọrọ gi mb͕e i bu orù? ya eb͕ula gi nb͕u n'obi: ma ọ buru kwa na i puru inwe onwe-gi, kari nke ahu were ya me ihe.
22 N'ihi na onye akpọrọ nime Onye-nwe-ayi, mb͕e ọ bu orù, ọ bu onye Onye-nwe-ayi mere ka o nwere onwe-ya: otú a onye akpọrọ, mb͕e o nwere onwe-ya, ọ bu orù Kraist.
23 Ewere ọnu-ahia b͕ara unu; unu aghọla ndi-orù madu.
24 Umu-nnam, onye ọ bula, nime ọnọdu nke akpọrọ ya, ya nọgide n'ọnọdu ahu n'ebe Chineke nọ.
25 Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.
26 Ya mere, anamechè na nka di nma n'ihi nkpà di ub͕u a, bù, na ọ di nma ka madu di otú ọ di.
27 Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n'aru nwunye? achọla nwunye.