6 Unu onwe-unu ghọchikwara ndi nēṅomi ayi na Onye-nwe-ayi, ebe unu were ọṅù nke Mọ Nsọ nara okwu ahu nke-ọma nime ọtutu nkpab͕u;
7 ya mere unu ghọrọ ihe-atù n'ebe ha nile, nọ, bú ndi kwere ekwe nime Masedọnia na nime Akaia.
8 N'ihi na okwu nke Onye-nwe-ayi esiwo n'aru-unu daputa udà, ọ bughi nání na Masedọnia na Akaia, kama n'ebe nile ọ bula okwukwe-unu n'ebe Chineke nọ aputawo ìhè; ya mere ọ dighi ayi nkpà ikwu okwu ọ bula.
9 N'ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n'ebe unu nọ; ya na otú unu siri n'arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu,
10 na ichere Ọkpara-Ya Onye gēsi n'elu-igwe bia, Onye O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, bú Jisus, Onye nādọputa ayi n'iwe nke nābia.