4 N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma.
5 N'ihi na anamagu na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi.
6 Ma asi na ọ bu ezie na abum onye nāmutaghi akwukwọ n'uzọ ikwu okwu, ma abughi m otú a n'uzọ ihe-ọmuma; kama ayi mere ka ọ puta ìhè nye unu n'ihe nile ọ bula n'etiti madu nile.
7 Ma-ọbu ọ̀ bu nmehie ka m'mehiere, mb͕e m'wedara onwem n'ala ka ewe welie unu onwe-unu elu, n'ihi na ezirim unu ozi ọma nke Chineke n'onyinye-efu?
8 Anapurum ihe n'aka nzukọ Kraist ọzọ, nānara ha ego-ọlu ka m'we jere unu ozi;
9 mb͕e m'nọ-kwa-ra n'etiti unu, nọ kwa na nkpà, abughi m onye ọ bula ibu arọ́; n'ihi na umu-nna-ayi, mb͕e ha si na Masedọnia bia, ha mezuru ihe nke fọdurum inwe; edebe-kwa-ram onwem n'uzọ nile ọ bula ka m'ghara inyib͕u unu, otú a ka m'gēdebe kwa onwem.
10 Dika ezi-okwu nke Kraist di nimem, agaghi-eb͕ochi inya-isi a nimem n'akuku nile nke Akaia.