14 ebe ayi matara na Onye ahu Nke mere ka Onye-nwe-ayi Jisus si n'ọnwu bilie, na Ọ gēme kwa ka ayi so Jisus si n'ọnwu bilie, Ọ gēche kwa ayi na unu n'iru Onwe-ya.
15 N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke.
16 N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi.
17 N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi;
18 ebe ayi nādighi-ele ihe anāhu anya, kama ihe anādighi-ahu anya: n'ihi na ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādighi-ahu anya di ebighi-ebi.