4 ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.
5 N'ihi na ọ bughi ayi onwe-ayi ka ayi nēkwusa, kama ọ bu Kraist Jisus, na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ayi nāsi kwa na ayi onwe-ayi bu ndi-orù-unu n'ihi Jisus.
6 N'ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n'iru nke Jisus Kraist.
7 Ma ayi nwere àkù a n'ite ájá, ka ọkika nke ike ahu we buru nke Chineke, ghara kwa isite n'ayi onwe-ayi;
8 anākpab͕u ayi n'akuku nile, ma adighi-akpab͕ubiga ayi ókè; ayi nwere obi abua, ma ayi adighi-enwebiga obi abua ókè;
9 anēsob͕u ayi, ma adighi-arapu nání ayi; anātuda ayi n'ala, ma adighi-ala ayi n'iyì;
10 ayi nēbughari n'aru-ayi mb͕e nile ob͕ub͕u nke Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'aru-ayi.