10 N'ihi na mb͕e ayi nọ n'etiti unu, ọ bu kwa nka ka ayi nēnye unu n'iwu, si, Ọ buru na onye ọ bula achọghi ilu ọlu, ya ghara kwa iri ihe.
11 N'ihi na ayi nuru okwu bayere ufọdu ndi nādighi-alu ọlu ọ bula, kama ha nētiye aka n'ọlu nke nābughi nke aka ha.
12 Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha.
13 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n'obi n'ime ihe ọma.
14 Ma ọ buru na onye ọ bula aṅaghi nti okwu ayi ji akwukwọ-ozi a kwu, ribanu onye ahu ama, ka unu ghara iso ya mekọ ihe, ka ewe me ya ihe-ihere n'iru.
15 Unu agukwala ya n'onye-iro, kama nādunu ya ọdú dika nwa-nna.
16 Ma Ya onwe-ya, bú Onye-nwe udo, Ya nye unu udo mb͕e nile n'uzọ nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere unu.