15 Nāgu-kwa-nu ogologo-ntachi-obi Onye-nwe-ayi na ọ bu nzọputa; dika nwa-nna-ayi ayi huru n'anya, bú Pọl, dega-kwa-ra unu n'akwukwọ, dika amam-ihe enyere ya si di;
16 dika ọ de-kwa-ra n'akwukwọ-ozi-ya nile; nēkwu okwu bayere ihe ndia nime ha; nke ihe ufọdu nke di ike ighọta di nime ha, nke ndi anēzíghi ihe na ndi nādighi-eguzosi ike nāchighari, dika ha nēme kwa ihe fọduru nke edeworo n'akwukwọ nsọ, ila onwe-ha n'iyì.
17 Ya mere, unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, ebe unu buru uzọ mara ihe ndia, nēchenu onwe-unu nche, ka aghara iwere njehie nke ndi nēmebi iwu bupu unu, unu we si na nguzosi-ike nke aka unu dapu.
18 Ma nābanu uba n'amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.