12 onye m'nēzighachiri gi, ya onye-ya, nke ahu bu, obi nkem:
13 onye mu onwem nēzuberi ijide ka mu na ya nọdu, ka o we nējerem ozi n'ab͕u nke ozi ọma n'ọnọdu gi:
14 ma achọghm ime ihe ọ bula mb͕e i kēkweyeghi; ka idi-nma-gi we ghara idi ka agāsi na ọ di n'uzọ nkpà, kama ka o we di n'uzọ ọchichọ-obi-gi.
15 N'ihi na eleghi anya ọ bu n'ihi nka ka ekewapuru ya n'ebe i nọ nwa oge ntà, ka i we nwe ya ebighi-ebi;
16 ọ dighi kwa ka orù ọzọ, kama ọ kariri orù, ọ di ka nwa-nna ahuru n'anya, nke kachasinu n'ebe m'nọ, ma nke kariri nke ahu nke-uku n'ebe i nọ, nime anu-aru na nime Onye-nwe-ayi kwa.
17 Ya mere ọ buru na i gurum n'onye-nnwekọ, nara ya nke-ọma dika mu onwem.
18 Ma ọ buru na o mejọrọ gi n'uzọ ọ bula, ma-ọbu na o ji gi ugwọ ọ bula, gua ya n'ugwọ m'ji gi;