5 Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.
6 Ma ya riọ n'okwukwe, ghara inwe obi abua: n'ihi na onye nwere obi abua yiri ebili-miri nke oké osimiri mb͕e ifufe nēfeghari ya, anātuli kwa ya elu.
7 N'ihi na, ka madu ahu ghara ichè na ọ gānata ihe ọ bula n'aka Onye-nwe-ayi;
8 ọ bu nwoke nwere uche abua, onye nādighi-eguzo n'otù ebe n'uzọ-ya nile.
9 Ma ka nwa-nna nke nọ n'ọnọdu di ala nya isi n'ọnọdu-ya di elu:
10 ma ka ọgaranya nya isi na emere ya ka ọ la ala: n'ihi na dika uzari ahihia ọ gāgabiga.
11 N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile.