7 Ọ̀ bughi ha onwe-ha nēkwulu aha ọma ahu nke aguru unu?
8 Otú ọ di, ọ buru na unu edebezu iwu nke Eze-ayi, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si kwu, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, unu nēme nke-ọma:
9 ma ọ buru na unu ele madu anya n'iru, ọ bu nmehie ka unu nēme, n'ihi na iwu ahu nātu unu nmehie-unu n'anya dika ndi-njehie.
10 N'ihi na onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n'otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara.
11 N'ihi na Onye ahu Nke siri, Akwala iko, Ọ si-kwa-ra, Eb͕ula madu. Ma ọ buru na i kwaghi iko, ma i nēb͕u madu, i ghọwo onye-njehie iwu.
12 Nēkwunu otú a, nēme-kwa-nu otú a, dika ndi agaje iwere iwu nke inwe-onwe-onye kpe unu ikpé.
13 N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.