33 Ya mere mb͕e Jisus huru ya ka ọ nākwa ákwá, na ndi-Ju ndi soro ya bia ka ha nākwa kwa ákwá, Ọ su udè nime mọ-Ya, me kwa ka obi lọ Ya miri,
34 O we si, Òle ebe unu tọb͕ọworo ya? Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, Bia, le kwa.
35 Anya-miri puru n'anya Jisus.
36 Ya mere ndi-Ju nāsi, Le otú Ọ huru ya n'anya!
37 Ma ufọdu nime ha siri, Onye a, Nke meghere anya onye ahu kpuru ìsì, Ọ̀ pughi ime kwa ka nwoke a ghara inwu anwu?
38 Ya mere Jisus nābiaru ílì ahu nāsu udè ọzọ nime Onwe-ya. Ma ọ bu ọb͕à, otù nkume nātọb͕ọ kwa n'ọnu-ya.
39 Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n'ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru.