6 Nke amuworo site n'anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ.
7 Ka ọ ghara iju gi anya na M'siri gi, Aghaghi imu unu ọzọ.
8 Ifufe nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i mataghi ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di.
9 Nikọdimọs zara, si Ya, Ìhe ndia si aṅa pu ime?
10 Jisus zara, si ya, Gì onwe-gi bu onye-ozizí Israel, ma i maghi ihe ndia?
11 N'ezie, n'ezie, asim i, Ayi nēkwu ihe ayi matara, ayi nāb͕a kwa àmà ihe ayi huru; ma unu anaraghi àmà-ayi.
12 Ọ buru na agwaram unu ihe nke uwa, ma unu ekweghi, ùnu gēsi aṅa kwere, ma ọ buru na agwam unu ihe nke elu-igwe?