6 Ndi-mọ-ozi ndi nēdebeghi ibu-isi nke aka ha, kama ha rapuru ebe-obibi nke aka ha, O debewo kwa ha n'ab͕u ebighi-ebi n'okpuru ọchichiri nye ikpé nke oké ubọchi ahu.
7 Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.
8 Ma otú ahu madu ndia nēmeru kwa anu-aru-ha n'irọ-nrọ-ha, ju kwa ibu-onye-nwe-madu, kwulu kwa ndi nọ n'ebube.
9 Ma Maikael onye-isi-mọ-ozi, mb͕e ya na ekwensu nārurita uka banyere aru Moses, ka ọ nēkwugide ya, o nweghi anya-ike ikpe ya ikpé nkwulu, kama ọ siri, Ka Onye-nwe-ayi bara gi nba.
10 Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n'ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha.
11 Ahuhu gādiri ha, n'ihi na ha gara n'uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n'ihi ugwọ-ọlu, we la n'iyì na nkwugide nke Kora.
12 Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n'oriri ihu n'anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n'oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu;