17 Ma ọ buru na ahuru na ayi onwe-ayi bu kwa ndi-nmehie, mb͕e ayi nāchọ uzọ agēsi gu ayi na ndi ezi omume nime Kraist, ọ̀ bu na Kraist bu onye nēje ozi nmehie? Chineke ekwela.
18 N'ihi na asi na ihe m'kwaturu, ihe ndia ka m'nēwuli elu ọzọ dika ulo, anameme ka madu mara na abum onye-njehie.
19 N'ihi, na mu onwem sitere n'aka iwu nwua n'ebe iwu di, ka m'we di ndu n'ebe Chineke nọ
20 Akpọgidekọwo mu na Kraist n'obe; ọ bughi kwa mu onwem nādi ndu ọzọ, kama ọ bu Kraist nādi ndu nimem ma ndu ahu m'nādi n'anu-aru ub͕u a, anamadi ya n'okwukwe, bú nke m'kwere n'Ọkpara Chineke, Onye hurum n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihim.
21 Ajughm amara nke Chineke: n'ihi na asi na ezi omume abia site n'aka iwu, ya mere Kraist nwuru n'efu.