22 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, na Abraham nwere umu-ndikom abua, otù site n'orù-nwanyi ahu, otù site kwa na nwanyi ahu nke nwere onwe-ya.
23 Ma ọ bu n'uzọ anu-aru ka amuworo nwa nke sitere n'orù-nwanyi ahu; ma esitewo na nkwa mu nwa nke sitere na nwanyi ahu nwere onwe-ya.
24 Ma ewere ihe ndia ma atù: n'ihi na ndinyom abua ndia bu ọb͕ub͕a-ndu abua; otù si n'ugwu Sainai puta, nāmu umu nye n'orù, nwanyi ahu bu Hega.
25 N'ihi na Sainai nka bu ugwu di n'Arebia, ya na Jerusalem nke di ub͕u a kwu kwa: n'ihi na ọ nọ n'orù, ya na umu-ya.
26 Ma Jerusalem nke di n'elu nwere onwe-ya, ya onwe-ya bu kwa nne ayi.
27 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa;Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme:N'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di.
28 Ma ayi onwe-ayi, umu-nnam, bu umu nke nkwa, dika Aisak.