26 Ma Jerusalem nke di n'elu nwere onwe-ya, ya onwe-ya bu kwa nne ayi.
27 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa;Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme:N'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di.
28 Ma ayi onwe-ayi, umu-nnam, bu umu nke nkwa, dika Aisak.
29 Ma dika onye amuru n'uzọ anu-aru sob͕uru onye amuru n'uzọ Mọ Nsọ mb͕e ahu, ọbuná otú a ka ọ di ub͕u a.
30 Otú ọ di, gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Chupu orù-nwanyi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwanyi agagheso nwa nke nwanyi ahu nke nwere onwe ya keta ihe.
31 N'ihi nka, umu-nnam, ayi abughi umu nke orù-nwanyi, kama ayi bu umu nke nwanyi ahu nwere onwe-ya.