34 N'ihi na unu ji obi so ndi nọ n'ab͕u hukọ ahuhu, unu were kwa ọṅù nara npunara ahu nke-ọma, bú nke apunara unu ihe nile unu nwere, ebe unu mara na unu nwere onwe-unu dika ihe unu nwere, bú ihe ka nma nke nādigide kwa.
35 Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu.
36 N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu.
37 N'ihi na le ka nwa oge ntà fọduru ra,Onye ahu Nke nābia gābia, Ọ gaghi-anọ kwa ọdù.
38 Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu:Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.
39 Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.