31 Okwukwe ka Rehab, bú nwanyi nākwa iko, ji ghara iso ndi nēkweyeghi ekweye lakọ n'iyi, ebe o were udo nata ndi ledoro obodo ahu anya.
32 Gini ka m'gēkwu kwa ọzọ? n'ihi na oge gāgwunarim ma ọ buru na akọm akukọ bayere Gideon, Berak, Samson, Jefta; ha na Devid na Samuel na ndi-amuma:
33 ndi sitere n'okwukwe lub͕u ala-eze, lu ọlu ezi omume, nata nkwa di iche iche, kpuchita ọnu ọdum,
34 menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n'okwukwe me ka ha di ike site n'adighi-ike, me ka ha di ike n'agha, ndi sitere n'okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ.
35 Ndinyom natara ndi-ha ndi nwuru anwu site na nbilite-n'ọnwu: ma etib͕uru ndi ọzọ, ebe ha juru inata nb͕aputa-ha; ka ha we nata nbilite-n'ọnwu ka nma:
36 ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:
37 aturu ha nkume, akwọwara ha, anwara ha, ewere iru mma-agha b͕ue ha: ha yiri akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ na nkpà, anākpab͕u ha, anēmejọ ha