2 N'ihi na asi na emere okwu ekwuru site n'ọnu ndi-mọ-ozi ka o guzosie ike, asi kwa na njehie nile ọ bula na aṅaghi-nti nile ọ bula natara nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ziri ezi;
3 àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n'ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ;
4 Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n'ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n'ọlu ike di iche iche, site kwa n'òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.
5 N'ihi na ọ bughi n'okpuru ndi-mọ-ozi ka O doro elu-uwa dum madu bi nke gaje ibia, bú nke ayi nēkwu okwu bayere ya.
6 Ma otù onye kwusiri ike n'otù ebe, si,Gini ka madu bu, na I nēcheta ya?Ma-ọbu nwa nke madu, na I nēleta ya?
7 I mere ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà;I ji ebube na nsọpuru kpube ya n'isi dika okpu-eze,I do-kwa-ra ya onye-isi ọlu nile nke aka-Gi abua:
8 Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua.N'ihi na na n'ido, ihe nile ahu n'okpuru ya, ọ dighi ihe ọ bula Ọ rapuru nke anēdoghi n'okpuru ya. Ma ub͕u a ayi akāhughi ihe nile ahu na edowo ha n'okpuru ya.