1 Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;
2 na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n'èzi-na-ulo-Ya dum.
3 N'ihi na aguwo Onye a n'Onye kwesiri otuto kari Moses, n'uzọ na otú ahu onye luru èzi-na-ulo nwere nsọpuru kari èzi-na-ulo-ya.
4 N'ihi na èzi-na-ulo ọ bula nwere onye luru ya; ma Onye luru ihe nile bu Chineke.