5 Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n'èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu;
6 ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.
7 N'ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi,Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,
8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu,Dika emere n'ubọchi ọnwunwa ahu n'ọhia,
9 Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem,Hu kwa ọlum ọgu arọ abua.
10 N'ihi nka ọnuma dim n'obi megide ọb͕ọ a,M'we si, Ha nējehie mb͕e nile n'obi-ha:Ma ndi ahu amaghi uzọm nile;
11 Dika M'ṅuru iyí n'iwe m si,Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.