4 N'ihi na O kwuwo n'otù ebe okwu bayere ubọchi nke-asa otú a, si, Chineke we zuru ike n'ubọchi nke-asa n'ọlu-Ya nile;
5 ọzọ, Ọ si kwa n'ebe a,Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.
6 Ya mere ebe ọ foduru ka ufọdu ba nime ya, ndi eburu uzọ zie ozi ọma abàghi kwa nime ya n'ihi ekweyeghi-ekwenye,
7 O we kà otù ubọchi ọzọ, nēkwu nime Devid, mb͕e ogologo oge di otú a gasiri, si, Ta, dika ebuworo uzọ kwue, si,Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,Unu emela ka obi-unu sie ike.
8 N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.
9 Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke.
10 N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya.