9 Ma, ndi m'huru n'anya, emewo ka ayi kwere ihe ka nma bayere unu, bú ihe nke ha na nzọputa yikọ kwa, ọ bu ezie na ayi nēkwu otú a:
10 n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.
11 Ma ọ nāgu ayi agu ka unu nile n'otù n'otù we nēgosi otù inu-ọku-n'obi ahu ka unu we nwezue olile-anya-ayi rue ọgwugwu ihe nile:
12 ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.
13 N'ihi na mb͕e Chineke kwere Abraham nkwa, ebe Ọ nēnweghi onye ọ bula ka Ya uku iji ṅu iyí, O ji Onwe-ya ṅu iyí,
14 si, Me-elu-me-ala n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme ka i ba uba.
15 Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu.