18 N'ihi na emere ka ihe eburu uzọ nye n'iwu ghara idi irè n'ihi adighi-ike-ya na abaghi-urù-ya,
19 (n'ihi na iwu ahu emeghi ihe ọ bula ka o zue okè), ewe webata olile-anya ka nma, nke ayi ji biaru Chineke nso.
20 Otú ọ dighi kwa ma ejighi iṅu-iyi,
21 (n'ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n'iṅu iyi site n'aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si,Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya,Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi);
22 ọ bu kwa n'uzọ ra otú a ka emeworo Jisus ka Ọ buru onye-ala ebe nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma.
23 Ọ bu kwa ezie na emewo ndi ahu ka ha buru ndi-nchu-àjà riri nne, n'ihi na ọnwu nēb͕ochi ha inọgide:
24 ma Ya onwe-ya, n'ihi na Ọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi, O nwere ọnọdu-onye-nchu-àjà-Ya nādighi-agabiga onye ọzọ.