1 Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,
2 Onye nēfè òfùfè n'ebe nsọ ahu, na n'ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu.
3 N'ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n'iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n'iru Chineke.
4 Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ: