10 N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕aMb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;M'gētiye iwum n'uche-ha,Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ:M'gābu-kwa-ra ha Chineke,Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:
11 Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya,Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi:N'ihi na ha nile gāmatam,Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha.
12 N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere,M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.
13 Mb͕e Ọ nāsi, Ọb͕ub͕a-ndu ọhu, O mewo nke-mbu ka ọ buru ihe ochie. Ma ihe nēme ochie, nke nāka kwa nká, ga-apu-n'anya nso.