1 N'ihi na anamachọ ka unu mata otú m'nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n'ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n'anu-aru;
2 ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist,
3 Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya.
4 Nka ka m'nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu.
5 N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.
6 Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya,
7 buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.