12 Epafras, onye bu otù onye n'etiti unu, orù nke Kraist Jisus, nēkele unu, nāb͕asi nb͕a ike n'ihi unu n'ekpere-ya nile mb͕e nile, ka unu we guzo dika ndi zuru okè ndi kwezuwo-kwa-ra ihe nile Chineke nāchọ.
13 N'ihi na anamab͕ara ya àmà, na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nke-uku nye unu na ndi nọ na Leọdisia na ndi nọ na Hierapọlis.
14 Luk, bú dibia nke ahuru n'anya, nēkele unu, ya na Dimas.
15 Kelenu umu-nna-ayi ndi nọ na Leọdisia, na Nimfas, na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.
16 Ma mb͕e ọ bula agāgusi akwukwọ-ozi a n'etiti unu, menu ka agu kwa ya na nzukọ Kraist nke ndi Leọdisia; lezi-kwa-nu anya ka unu onwe-unu gu kwa akwukwọ ozi ahu si na Leọdisia bia.
17 Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya.
18 Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de. Chetanu ab͕um. Ka amara diyere unu.