5 N'ihi ya ọ di nkpà ido onwe-unu n'okpuru ya, ọ bughi nání n'ihi iwe ahu, kama ọ bu kwa n'ihi akọ-na-uche.
6 N'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu nātu kwa ùtú; n'ihi na ha bu ndi nēfè Chineke òfùfè, nānọgidesi ike n'ọlu-ha ime otù ihe a.
7 Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n'ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú; tunu ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru.
8 Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n'anya: n'ihi na onye nāhu madu-ibe-ya n'anya edebezuwo iwu.
9 N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
10 Ihu-n'anya adighi-alu ọlu ọjọ n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: ya mere ihu-n'anya bu idebezu iwu.
11 Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.