12 Kelenu Traifina na Traifosa ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime Onye-nwe-ayi. Kelenu Pasis onye ahuru n'anya, n'ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu n'ọtutu ihe nime Onye-nwe-ayi.
13 Kelenu Rufọs onye arọputara nime Onye-nwe-ayi, na nne-ya nke bu kwa nnem.
14 Kelenu Asinkritọs, Flegon, Hamis, Patrọbas, Hamas, na umu-nna ndi ha na ha nọ.
15 Kelenu Filọlọgọs na Julia, Nireọs na nwa-nne-ya nwayi, na Ọlimpas, na ndi nsọ nile ndi ha na ha nọ.
16 Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita onwe-unu. Nzukọ Kraist nile nēkele unu.
17 Ma anamariọ unu, umu-nnam, ka unu le ha anya, bú ndi nēweta nkewa di iche iche ahu na ọnyà di iche iche ahu, nēmegide ozizí nke unu onwe-unu mutara: ka unu nēze kwa ha.
18 N'ihi na ndi di otú a abughi orù nke Onye-nwe-ayi Kraist, kama orù nke afọ nke ha; ha were kwa okwu utọ ha na okwu ọma ha nāghọb͕u obi ndi nāmaghi ihe ọjọ.