14 Kelenu Asinkritọs, Flegon, Hamis, Patrọbas, Hamas, na umu-nna ndi ha na ha nọ.
15 Kelenu Filọlọgọs na Julia, Nireọs na nwa-nne-ya nwayi, na Ọlimpas, na ndi nsọ nile ndi ha na ha nọ.
16 Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita onwe-unu. Nzukọ Kraist nile nēkele unu.
17 Ma anamariọ unu, umu-nnam, ka unu le ha anya, bú ndi nēweta nkewa di iche iche ahu na ọnyà di iche iche ahu, nēmegide ozizí nke unu onwe-unu mutara: ka unu nēze kwa ha.
18 N'ihi na ndi di otú a abughi orù nke Onye-nwe-ayi Kraist, kama orù nke afọ nke ha; ha were kwa okwu utọ ha na okwu ọma ha nāghọb͕u obi ndi nāmaghi ihe ọjọ.
19 N'ihi na iṅa-nti-unu eruzuwo na nti madu nile. Ya mere anamaṅuri ọṅu n'isi unu: ma anamachọ ka unu buru ndi-amam-ihe n'ebe ezi ihe di, ma ndi arughi-árú n'ebe ihe ọjọ di.
20 Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ.Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.