2 ka unu we nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi, dika o kwesiri ndi nsọ, ka unu nēguzo kwa ya nso iyere ya aka n'okwu ọ bula nkpà unu gākpa ya: n'ihi na ya onwe-ya aburuwo kwa onye nēguzoro ọtutu madu izọ ha, mu onwem kwa.
3 Kelenu Priska na Akwila ndi mu na ha nālukọ ọlu nime Kraist Jisus,
4 madu ndi tọb͕ọrọ olu nke aka ha n'ihi ndum; ndi ọ bughi nání mu onwem nēkele, kama nzukọ Kraist nile nke ndi mba ọzọ kwa:
5 kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m'huru n'anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist.
6 Kelenu Meri, n'ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu n'ọtutu ihe nye unu.
7 Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n'agha, madu ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist.
8 Kelenu Amplietọs, onye m'huru n'anya nime Onye-nwe-ayi.